IVORY TOWER ORGANIZATION
Ejiri mara anyi – IGBASA OZI OMA, ENYEMAKA (Mak. 16:15, Jemes, 1:27)
AMA IZU IKE NKE OTUTU EGWUREGWU NYE NDI NTOROBIA NKE NAIJIRIA.
Ndi Ntorobia bu ndi na-ewulite obodo, burukwa ndi ga-achi ochichi n’oge di n’iru. Echiche obi anyi bu iru AMA IZU IKE NKE OTUTU EGWUREGWU na LOKAL GOVAMENTI ndi nogasi n’ala anyi bu Naijiria.
NDI ANYI BU:
Ndi Ivory Tower organization bu ndi otu Kraist nke na-anabata mmadu niile burukwa ndi enyemaka ndi ochicho ha bu ijekuru ndi anakazoputaghi n’elu uwa nile site na:
NKE MBU
IGBASA OZI OMA:
Ozi oma anyi nke bu inaputa mkpuruobi na-erute otutu mmadu ubochi nile site na nkpokota igwe mmadu nke anakpo KRUSEDI nakwa otutu uzo ndi ozo di iche iche.
NKE ABUO
ENYEM AKA:
Agba nke ochie na agba nke ohuu nke akwukwo nso nyere iwu k’anyi ghara ichefu ndi ihe na-esiri ike ma o bu ndi uwa na-atu na onu. Okpukpo oku anyi n’akuku nke a na-eduru anyi jee ileta ndi no n’ime ulo mkporo, ndi no n’ulo ogwu, ebe ana-azu umu aka na enweghi nne na nna, nakwa inyere ndi ogbenye onu ntu aka. Ozokwa, anyi na enyere ndi ukochukwu nakwa nzuko nke Kraist gburugburu uwa nile aka.
NKE ATO:
IRU AMA IZU IKE NKE OTUTU EGWUREGWU
Echichie oma nke a nke sitere na Mo Nso ka echeworo nye umu okoro na agbogho nke Nairjiria. Iru Ama izu ike nke otutu Egwuregwu na Lokal Govanmenti ndi nogasi n’ala anyi ga-adi ka ngwa olu nke eji ebuli umu mmadu site na ina ejeghari njem na enweghi isi na odu na okporo uzo, wee mee ka ha buru ezi ndi ama ama na obodo.
Anyi na-eleba anya na ichoputa ndi nwere onyinye (akaraka) na ibulikwa akaraka ndia ka ha puta ihe na ogo di elu. Itinye umu okoro na agbogho ime otutu egwuregwu na ihe omume ndi ozo iji kagbuo ume ngwu, nke ga-ewedata enweghi aka oru, onu ogugu izu ohi, iba otu ojoo digasi iche iche, igba akwula, oke anumanu na otutu ihe ojoo juputara na ndu umu okoro na agbogho nke Naijiria.
Agbanyeghi ihe ndi a nile, ochicho nke sitere na ime mmuo anyi bu itinyechasi ibi ezi ndu na itu egwu Chineke n’ime umu okoro na agbogho. Dika esi deputa ya na ala ala ebe a bu ka aga-esi na-eme ihe na AMA EGWUREGWU ndi a na-oge,n’ oge
iv. OZIZI UZO ESI AKPATA EGO
N’onwa nile ma o bu na onwa ato nile ka aga na-enwe ozizi, nke kachasi nke, iji mee ka ndi na-eto eto na ala anyi mara mkpa o di inwe ezi aku na uba site na ezi nto ala echiche, irusi oru ike, ekpere na itinye uchu na oru.
Iwepugasi echiche ha na nghota joro njo nke tunyere aka na igwo ogwu ego, igbu mmadu na ime mpu dika nani uzo ndi apuru iji baa ogaranya.
v. ODIDE AKWUKWO
N’ezie, anyi ga-azuputa ndi nwere akaraka n’ihe odide, ndi ga na-edeputa akwukwo ogugu ndi bara uru, akwukwo ndi ana-agu na oge ezumike, ndi eji agbasa ozi oma, ndi na akowa gbasara ihe ndi n’ime na elu uwa nke bu Nuspepa na Magazini. Anyi nwere otutu ndi okachamara na mkpaghara nke a.
iv. IGU EGWU
Site na iguputa egwu ndi sitere na mmuo Nso, ndu otutu mmadu ga abu ihe emeturu aka n’elu uwa nile. Ndi okachamara ndi anyi nwere ga-azuputa ndi ogu egwu ndi na-echeputa na-edeputakwa egwu, ndi ma ka-esi ahazi ngwa egwu nakwa otutu ihe ndi ozo. Nke kachasi mkpa, anyi ga-ejiko aka onu wee nyere otutu mmadu aka kuputa egwu nke ana akpo ALBUM na okwu bekee.
vii. IHE ONYOONYOO
Anyi na alusi olu ike n’oge ndi a iweputa ihe onyoonyoo nke bu ihe nlera anya anakpo FILM na Okwu bekee nakwa nchikota akuko ana eweputa n’onyoonyoo nke anakpokwa DOCUMENTARY na okwu bekee. Anyi nwere ndi okachamara na mkpaghara nke a, ndi dikwa na ezi njikere izuputa ndi odide ihe onyoonyoo, ndi nruputa ihe onyoonyoo, ndi na achikota ihe onyoonyoo, na otutu ndi nile oru aka ha bu nani ihu ghasara ka-esi eme ihe onyoonyoo.
viii. REDIO/TELEVISHION:
Ndi IVORY TOWER ORGANIZATION n’oge di n’iru ga na-enyere otutu ezi na ulo aka ito eto n’ime Mo Nso site na nkwurita okwu na Redio nakwa ihe omume nke TV. Ndi okachamara anyi nwere na mkpaghara nke ihe nkwurita okwu Redio na ihe omume TV ga-enye umu okoro na agbogho ozuzu bu ndi nwere mmasi na mkpaghara nke a.
OKWESIRI KAM SONYE NA ATUMATU NDI A?
Ee, ikwesiri. Ime ka echiche ukwu a buru ihe nwere isi, anyi natara ntuzi aka sitere na mmuo Nso ka mmadu nile soro: Ndi Govanmenti, Ndi ulo oba oge, Ndi na-ewere umu mmadu n’oru bekee, ulo akwukwo di iche iche, nzuko ofufe di iche iche, ndi otu okachamara di iche iche, ndi otu izu ahia, ndi otu ugbo njem digasi iche iche, ndi na-amu oru aka digasi iche iche, ndi oji ego achu nta ego n’uzo ndi ziri ezi,ndi oru bekee, ndi ndoro ndoro ochichi, ndi otu nile nke kwuuru onwe ha ma o bu NGO’s na Okwu bekee, ndi otu umu nwanyi, ndi otu ntoroobia, umu akwukwo, ndi Eze odinaala na obodo nile ha na-achi, ndi isi na-achi ime ime obodo nile, umu mmadu nakwa umu mmadu no na ezi otu ndi iche iche.
ENYEMAKA NA NKWAGIDE NKE MMADU NILE GOSIPUTARA NA MMADU DUM SONYE NWEE AMA IZU IKE NKE OTUTU EGWUREGWU NDI A, NAKWA OMUME EGWUREGWU NA IHE NDI OZO GA-ABU N’EFU NYE MMADU NILE.
Kedu uzo m puru isi sonye?
Inwere ike igosiputa mmasi iburu onye otu Ivory Tower Organization k’anyi wee nwee ike izitere gi akwukwo nke eji edebanye aha ibu onye otu anyi. Inwekwara ike icho ka I buru onye na achikota atumatu a na Steti ma o bukwa na Lokal Govanmenti gi site na ntuzi aka ndi digasi n’okpuru ebe a k’anyi nwee ike zitere gi akwukwo idenye ihe ndi kwesiri ekwesi.
Ozo, inwere ike choo I bu onye enyem aka nke Organization anyi ma o bu onye enyem aka mgbe ichoro nke putara na ina esonye ozi oma nke ogwugwu oge a.
BIKO GOSI MMASI GI SITE NA IKANYE AKARA OTU A
A B C OR
AB, AC, ACB
ma o bu ka osi di gi nma.
Biko gbasoro iwu ndi a:
A. Achoro m ibu onye otu unu (B) Achoro m I bu onye nchikota nke Steti ma o bu Lokal Govamenti nke m
C. Achoro m I bu onye enye m aka (Mgbe m choro mgbe nile )
a. Aha gi __________ Aha nna gi ___________
b. Ebe ina anata ozi (Leta) _________________
c. Ekwenti gi ____________________________
d. Aha iji anata ozi na komputa (E-mail)
e. Ebe enwere ike ichota gi?________________
_____________________________________
_____________________________________
f. Igwe nke iji eziga ma o bu anata ozi (Fax) _____________________________________
_____________________________________
(Ma ichoo) inwere ike deputa ekpere di gi mkpa ma o bu ekpere ndi di gi mkpa n’oghere ndi emeputara maka nke a:
Biko doputa iberibe akwukwo nke a, tinye ya n’ime envelopu, nakwa ego ole di gi mma (ego ana-ahu anya ma o bu nke di na akwukwo cheku), tinyekwa aha gi na ego ole itinyere.
Nyeghachi ya ndi bu ezi ndi otu anyi, tuba n’ime igbe ma o bukwanu jee nye ya na ebe ulo oru anyi di ma o bu ebe obula anyi na-enwe ofufe nke di gi nso.
Kama ichoo izitere anyi akwukwo site na-ebe ana anata leta (post office) ma o bu izitere anyi ego site n’ulo oba ego, biko kpoo ma o bu dega ihe odide site na akara ekwenti ndi a k’anyi gwa gi uzo I puru isi tinyere anyi ego ma o bukwanu zitere anyi leta: 07025195409.08134996131,08038567794. (E-mail- ivorytower98@yahoo.co.uk)
EKPERE DI GI MKPA MA O BU NDI DI GI MKPA
1. ____________________________________
2 ____________________________________
3. ____________________________________
4. ____________________________________
5. _____________________________________
6. _____________________________________
7. _____________________________________
8. ____________________________________
9. _____________________________________
10. _____________________________________
11. _____________________________________
12. _____________________________________
UZO ANYI JI AMALITE ORU
Na mbu, anyi na-agbalisike itinyesi ebe IVORY TOWER ORGANIZATION ga na-enwe ofufe n’ime ulo nke anyi kwuru ugwo ma o bukwanu otu n’ime ulwo akwukwo no na Lokal Govanmenti anyi banyere.
Site n’ebe ahu anyi amalite igbasara oha na eze no na Lokal Govanmenti ahu ozi oma. Mgbe obere oge gasiri, anyi emee ka echiche obi anyi puta ihe nke bu agbam onya ego maka iru AMA IZU IKE NKE OTUTU EGWUREGWU di iche iche, di k’anyi ga ariokwa nsonye nke mmadu niile na Lokal govanmenti ahu.
IVORY TOWER OGANIZATION
N’aluko olu ntukota aka onu ya na ndi ochichi ala anyi site na ndi na achi Lokal Govanmenti di iche iche. Anyi na-eme ka onye isi ochichi na-achi Lokal Govanmenti n’oge ahu nke banyere buru onye ana-akwanyere ugwu, burukwa onye nkwagidesike atumatu a n’oge nile o no n’ochichi.
Ndi ozo ga-abukwa obia puru iche na lokal govanmenti o bula anyi banyere ga-abu: Ndi niile chiworo ochichi n’oge gara aga, n’akwa ndi niile nokwa n-achi achi n’oge ahu. Ndi eze odi n’ala, nakwa ndi niile amaara AHA HA n’ime Lokal Govanment ahu.
Ozi Oma ga-ewe abali ato nke anakpo CRUSADE n’okwu bekee gadiriri nye umu okoro na agbogho nakwa umu akwukwo nke Lokal Govanmenti o bula nke anyi banyeworo tutu ebido agbam onya ego n’ubochi nke na-esonye ya.
IJI MEE KA ATUMATU A NOGIDESIA IKE
Iji hu na ihe ndi di ohuu nakwa ezi ndozi onodu ga na-adi na Ama izu ike nke otutu egwuregwu ndi a, atumatu agbam onya ego a ga na abu ihe ana-eme n’afo nile na lokal govanmenti digasi iche iche.
Maka ajuju degara ma o bu kpoo: ivorytower98@yahoo.co.uk
08134996131, 07025195409,08038567794,08067167142
websites – www.ivorytowernig.blogspot.com
Maka Ekpere/Ndumodu kpoo: 08038567794, 08065558958, 08134996131.
Iji mara ebe anyi na-enwe ofufe nke di gi nso, zitere anyi akara edemede (text) ma o bu kpoo otu n’ime akara ekwenti ndi a:
070251955409, 08134996131, 08038567794.
Chineke gozie gi.
Zuby Godwin (08134996131)
Maka: IVORY TOWER ORGANIZATION
No comments:
Post a Comment